Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a?
mb͕e ahu ka ihe-iriba-ama nke Nwa nke madu gāputa kwa ìhè n'elu-igwe: mb͕e ahu ka ebo nile nke uwa gēti kwa aka n'obi, ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe n'ike na oké ebube.
Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n'uzọ okwukwe.
asi kwa na O mereghi uwa ochie ebere, kama ọ bu Noa, onye mere ha asatọ, bú onye nēkwusa ezi omume, ka O chere, mb͕e O mere ka iju-miri biakwasi uwa nke ndi nādighi-asọpuru Chineke;