Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 24:30 - Bible Nso

30 mb͕e ahu ka ihe-iriba-ama nke Nwa nke madu gāputa kwa ìhè n'elu-igwe: mb͕e ahu ka ebo nile nke uwa gēti kwa aka n'obi, ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe n'ike na oké ebube.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 “Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 24:30
17 Iomraidhean Croise  

Anọm nāhu n'ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n'igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n'iru Ya.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


N'ubọchi ahu oké otiti-aka-n'obi gādi na Jerusalem, dika otiti-aka-n'obi nke Hedad-rimon nime ndagwurugwu Megidon.


Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a?


Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.


ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.


Jisus si ya, Gi onwe-gi kwuru: otú ọ di, asim unu, Site n'ub͕u a unu gāhu Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe.


Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji nile n'oké ike na ebube.


Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula agaje imezu ihe ndia nile?


Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji, Ya na ike na oké ebube.


Ma site n'ub͕u a ka Nwa nke madu gānọdu n'aka-nri nke ike Chineke.


ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n'elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu nọ rigo n'elu-igwe, gābia n'otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n'elu-igwe.


na inyeghachi unu, bú ndi anākpab͕u, aru-efè, ayi na unu, nime nkpughe nke Onye-nwe-ayi Jisus site n'elu-igwe, Ya na ndi-mọ-ozi nke ike-Ya,


Le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya, ndi ahu gāhu kwa Ya, bú ndi mara Ya ube; ebo nile nke uwa gēti-kwa-ra ya aka n'obi. E, Amen.


Ewe hu oké ihe-iriba-ama n'elu-igwe; nwanyi nke egbokwasiworo ya anyanwu dika uwe, ọnwa di kwa n'okpuru ukwu-ya abua, ọ nēkpu kwa okpu-eze nke kpakpando iri na abua n'isi-ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan