Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 24:17 - Bible Nso

17 onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 24:17
14 Iomraidhean Croise  

O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.


Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya.


Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo.


mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:


onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya.


N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?


Ya mere ihe ọ bula unu kwuru n'ọchichiri, agānu ya n'ìhè; ihe unu kwu kwa-ra na nti n'ime-ulo ntà, agēkwusa ya n'elu ulo.


Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n'ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n'elu ulo, we si n'okpukpu ulo buda ya na ute-ya n'etiti n'iru Jisus.


Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi:


Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.


Ha we si n'ebe di elu ahu rida n'obodo, o we kpayere Sọl uka n'elu-ulo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan