Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 23:4 - Bible Nso

4 Ma ha nēke ibu di arọ́ di kwa ike obubu, tukwasi ha n'ubu madu; ma ha onwe-ha achọghi iji otù nkpisi-aka-ha wezuga ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 23:4
10 Iomraidhean Croise  

Bel eruruwo ala, Nebo amakpuwo amakpu; arusi nile ha di n'elu anumanu na n'elu anu-ulo: ihe nile unu nēbughariri bu ibu eboro ebo, ha bu ibu eboro anu nāda #mbà.


Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēnye otù uzọ n'uzọ iri nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ na anise na cummin, unu arapuwo kwa ihe ka arọ́ n'iwu, bú ikpé, na ebere, na okwukwe: ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.


ya mere, ihe nile, ka ha ra, bú nke ha gāsi unu me, menu ihe ndia, debe kwa ha: ma unu emela dika ọlu nile ha si di; n'ihi na ha nēkwu, ma ha adighi-eme.


O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n'ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu.


Ya mere, ub͕u a, gini mere unu nānwa Chineke, n'ikoye yoke n'olu ndi nēso uzọ Jisus, nke ma nna-ayi-hà ma ayi onwe-ayi nēnweghi ike ibūru?


N'ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà:


N'ihi na ndi kwere ka ebì ha úgwù, ọbuná ha onwe-ha adighi-edebe iwu; kama ha nācho ka ebì unu úgwù, ka ha we nya isi n'anu-aru unu onwe-unu.


N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́.


Ma unu ka m'nāgwa, bú ndi fọduru na Taiataira, ka unu ra, bú ndi nēnweghi ozizí a, madu ndi nāmaghi ihe nile di omimi nke Setan, dika ha nēkwu; ebokwasighi m unu ibu arọ́ ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan