Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 23:35 - Bible Nso

35 ka ọbara ndi ezi omume nile awusiworo n'elu uwa we biakwasi unu, site n'ọbara Ebel onye ezi omume ahu rue ọbara Zakaraia nwa Barakaia, onye unu b͕uru n'ab͕ata ulo nsọ na ebe-ichu-àjà-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 23:35
22 Iomraidhean Croise  

Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n'ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n'ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya.


Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


ọzọ kwa, n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n'ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.


Dozierenu umu-ya ebe-ob͕ub͕u n'ihi ajọ omume nke ndi bu nna-ha; ka ha we ghara ibili, nweta uwa, me ka elu-uwa dum madu bi juputa n'obodo.


N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.


N'efu ka M'tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.


Ọzọ, n'ọnu-ọnu-uwe-gi ka achọtaworo ọbara nke nkpuru-obi nke ndi-ob͕eye nēmeghi ihe ọjọ: ọ bughi na ntipú-ulo ka i chọtara ha, kama ọ bu n'ihi ihe ndia nile.


Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m'nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n'aru unu, na n'aru obodo a, na n'aru ndi bi ya: n'ihi na n'ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu.


ha we me ka Uraia si n'Ijipt puta, ha we me ka ọ biakute eze, bú Jehoiakim; o we were mma-agha tibue ya, tubà ozu-ya n'ílì umu ndi Israel.


O rue, mb͕e Jeremaia kwubìri okwu nile nke Jehova nyere ya n'iwu igwa ndi Israel nile, na ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile jidere ya, si, I ghaghi inwu anwu.


N'ọnwa nke-asatọ, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, ka okwu Jehova ruru Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si,


Unu emeru-kwa-la ala ahu nke unu onwe-unu bi nime ya: n'ihi na ọbara, nke ahu nēmeru ala: ma ala, agaghi-ekpuchiri ya nmehie-ya bayere ọbara awusiri nime ya, ma-ọbughi nání n'ọbara nke onye wusiri ya.


site n'ọbara Ebel rue ọbara Zakaraia, onye lara n'iyì n'ab͕ata ebe-ichu-àjà na ulo nsọ unu: e, asim unu, agāchọputa ya n'aka ọb͕ọ a.


si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi.


Okwukwe ka Ebel ji che àjà n'iru Chineke nke ka àjà Kain chere nma, nke esitere na ya b͕ara ya àmà na ọ bu onye ezi omume, ebe Chineke b͕ara àmà bayere onyinye-ya nile: o site kwa na nke ahu nēkwu okwu ub͕u a, ọ bu ezie na ọ nwuru anwu.


na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.


Ọ bu kwa nime ya ka ahuru ọbara nke ndi-amuma na nke ndi nsọ, na nke ndi nile eb͕uworo n'elu uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan