Matiu 23:27 - Bible Nso27 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu yiri ili eteworo nzu, nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n'ìhè, ma n'ime ha juputara n'ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adighi-ọcha nile. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a27 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha. Faic an caibideil |