Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 23:15 - Bible Nso

15 Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nējeghari n'oké osimiri na ala kpọrọ nku buruburu ka unu me otù onye ka o so uzọ-unu; ma mb͕e ọ ghọrọ otú ahu, unu nēme ya okpukpu abua nwa ọku ala-mọ kari onwe-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 23:15
17 Iomraidhean Croise  

N'ala nile ọ bula anāchi achi, na n'obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n'ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?


ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.


Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ.


Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.


si, Gi onye juputara n'aghughọ nile na ihe nile jọb͕uru onwe-ya, gi nwa ekwensu, gi onye-iro ezi omume nile, ì gaghi-arapu ikwahie uzọ nile eguzoziri nke Onye-nwe-ayi?


Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke.


Ma ndi-Ju siri n'Antiọk na Aikọniọm bia rue ebe ahu: mb͕e ha rafusiri ìgwè madu nile, ha tua Pọl nkume, dọkpupu ya n'azu abodo, nēchè na ọ nwuru anwu.


Ma ndi-Ju ndi nēkweyeghi kpaliri nkpuru-obi ndi mba ọzọ, me ka ha jọ njọ n'ebe umu-nna nime Kraist nọ.


Ma mb͕e ndi-Ju nke Tesalọnaika mara na Pọl nēkwusa kwa okwu Chineke na Beria, ha bia-kwa-ra ebe ahu, nākpali ìgwè madu nile, nēme kwa ka obi lọ ha miri.


nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju,


Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:


Ha were obi nānu ọku chọ unu n'uzọ nādighi nma; ma ha nāchọ imechibido unu uzọ n'èzí, ka unu we were obi nānu ọku chọ ha.


Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha ma nma n'anu-aru n'iru madu, ndi ahu nērugide unu ka ebì unu úgwù; ihe ha ji me ya bu nání ka ewe ghara isob͕u ha n'ihi obe Kraist.


ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n'etiti ha n'oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan