ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.
Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;
Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.