Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:
ka eme ka unu nile na ndi Israel nile mara, na ọ bu n'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe, Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n'aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n'iru unu n'ebe a.
Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya: