Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 21:1 - Bible Nso

1 Ma mb͕e ha biaruru Jerusalem nso, bia kwa na Betfagi, rue ugwu Olive, mb͕e ahu Jisus zigara madu abua nēso uzọ-Ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 21:1
13 Iomraidhean Croise  

Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n'ubọchi ahu n'elu ugwu Olive, nke di n'iru Jerusalem n'Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n'etiti abua ya n'akuku Ọwuwa-anyanwu na n'akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n'akuku Ugwu, nkera-ya n'akuku Ndida.


Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.


si ha, Ganu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu, ngwa ngwa unu gāhu inyinya-ibu elibeworo, ya na nwa-inyinya-ibu: tọpunu ha, sekputaram ha.


Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a?


Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.


Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive na ncherita-iru ulo uku Chineke, Pita na Jemes na Jọn na Andru we jua Ya iche, si,


Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.


Kwa-ubọchi O nēzí ihe n'ulo uku Chineke; kwa-abali Ọ nāpu, nānọ ọnọdu-abali n'ugwu anākpọ ugwu Olive.


O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya.


Mb͕e ahu ha siri n'ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan