33 Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, ka ewe meghe anya-ayi.
33 Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.”
Kpughepu anyam abua, ka m'we legide Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta.
Jisus we guzo, kpọ ha, we si, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu?
Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.