Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 20:1 - Bible Nso

1 N'ihi na ala-eze elu-igwe yiri nwoke nke bu nna-nwe-ulo, onye puru n'isi-ututu igota ndi-ọlu ije n'ubi-vine-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 20:1
22 Iomraidhean Croise  

O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mb͕e ọ ghara nkpuru ọma n'ubi-ya:


O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ala-eze elu-igwe yiri nkpuru mustard, nke madu were, gha n'ubi-ya:


Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.


Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri oké úb͕ú awuyere nime oké osimiri, nke kpokọta-kwa-ra ufọdu n'aha azù nile di iche iche:


Ma mb͕e ya na ndi-ọlu ahu nwere otù olu ka o nye ha otù shilling kwa-ubọchi, o zigara ha n'ubi-vine ya.


Ma gini bu uche-unu? Otù nwoke nwere umu abua; o we biakute nke-mbu, si, Nwa, je lua ọlu ta n'ubi-vine nkem.


Eji ala-eze Chineke tuyere otù nwoke bú eze, nke siri oriri ọlulu-nwunye nye nwa-ya nwoke,


Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!


Mb͕e ahu agēji ala-eze elu-igwe tuyere umu-ab͕ọghọ iri, ndi chiri ọwa-ha, pua izute onye nālu nwunye ọhu.


N'ihi na ọ di ka mb͕e madu, mb͕e ọ gaje inọdu n'ala ndi ọzọ, ọ kpọrọ ndi-orù nke aka ya, rara ihe nile o nwere nye n'aka-ha.


si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.


Ọ di ka mb͕e madu, onye jere inọdu n'ala ndi ọzọ, ebe ọ rapuru ulo-ya, nye kwa ndi-orù-ya ọlu ichi-isi, nye onye ọ bula nime ha ọlu-ya, o nye-kwa-ra onye-ọnu-uzọ iwu ka ọ che nche.


Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi.


Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.


Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan