Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 2:4 - Bible Nso

4 O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n'ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 2:4
30 Iomraidhean Croise  

Ha bu kwa ndi-isi nke ndi-ibu, ha nēdu kwa ndi nile nēje ozi ifè òfùfè ọ bula: ufọdu nime ndi Livai bu kwa ndi-ode-akwukwọ, na ndi-odozi-okwu, na ndi-ọnu-ama.


Hilkaia we za, si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu.


Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem.


Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi.


Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.


na Salu, na Amok, na Hilkaia, na Jedaia. Ndia bu ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na umu-nne-ha n'ubọchi Jeshua.


Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha, Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù, Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,


Ùnu si aṅa si, Ndi mara ihe ka ayi bu, iwu Jehova di kwa n'aka ayi? Ma otú o di, le, okwu-ugha ka pen ugha nke ndi-ode-akwukwọ meworo ya.


N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.


O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n'àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie.


Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile.


Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n'ihi na otú a ka edeworo ya n'akwukwọ site n'aka onye-amuma, si,


Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ huru ọlu-ebube nile Ọ luru, na umuaka ndi nēti nkpu n'ulo uku Chineke, si, Hosanna diri Nwa Devid; iwe were ha nke-uku,


Mb͕e Ọ batara n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we biakute Ya mb͕e O nēzí ihe, si, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ònye nye-kwa-ra Gi ike a?


Mb͕e ahu ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ n'obí onye-isi-nchu-àjà, onye anākpọ Kaiafas;


Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ.


Ma mb͕e o ruru ututu, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nile nke ndi-Ju b͕ara ìzù megide Jisus ime ka Ọ nwua:


n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ-ha.


O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.


Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n'otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha.


Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we guzo, nēbo Ya ebubo si-ike.


Ya mere Judas, ebe ọ natara òtù ndi-agha, na ndi nēje ozi site n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi, ọ chiri oriọna na ọwa na ihe-agha bia n'ebe ahu.


Jisus zara, si ya, Gì onwe-gi bu onye-ozizí Israel, ma i maghi ihe ndia?


Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya.


Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we kuta otù nwanyi nke ejidereri n'ikwa-iko; mb͕e ha guzosiri ya n'etiti,


Oké iti-nkpu we puta: ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ ndi di n'akuku ndi-Farisi we guzo ọtọ, lu kwa ọ̀gù, si, Ayi ahughi ihe ọjọ n'aru nwoke a: ma gini kwa ma ọ buru na mọ ma-ọbu mọ-ozi gwara ya okwu?


O we rue n'echi-ya, na ndi-isi-ha na ndi-okenye-ha na ndi-ode-akwukwọ-ha zukọrọ na Jerusalem;


Ha we kpalie ndi-Ju, na ndi-okenye, na ndi-ode-akwukwọ, we biakwasi ya, jide ya, kubata ya na nnọkọ-ikpé,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan