21 O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, je ala Israel.
21 Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel.
Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.
si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, ga ala Israel: n'ihi na ndi nāchọ ndu Nwatakiri ahu anwuwo.
Ma mb͕e ọ nuru na Akeleọs bu eze Judia n'ọnọdu nna-ya Herod, ọ turu egwu ije ebe ahu; ma ebe Chineke duru ya ọdú na nrọ, o wezugara onwe-ya ga n'akuku Galili,
Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje.