Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 2:2 - Bible Nso

2 si, Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju? n'ihi na ayi huru kpakpando-Ya n'Ọwuwa-anyanwu, ayi we bia ikpọ isi ala nye Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 2:2
28 Iomraidhean Croise  

Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike N'elu Zaion, bú ugwu nsọm.


Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike: N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya.


Mba nile gējeru kwa ìhè-gi, ndi-eze ejerue onwu-maramara nke ọwuwa-gi.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.


ma ha gēfè Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha, onye M'gēme ka o biliere ha.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,


Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile.


Sinu ada Zaion, Le, Eze-gi nābiakute gi, Ọ di nwayọ, Ọ nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, Na n'elu nwa-inyinya-ibu, bú nwa anu nēbu ibu.


Ma Jisus guzoro n'iru onye-isi: onye-isi ahu we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus we si ya, Gi onwe-gi kwuru.


si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu.


n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi.


Pailat we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru.


Ma ihe-ndekwasi di kwa n'elu isi-Ya, ONYE A BU EZE NDI-JU.


Nataniel zara Ya, si, Rabai, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel.


ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel.


Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum.


Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n'elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU.


Tomas zara, si Ya, Onye-nwem na Chinekem.


ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya.


O we si, Onye-nwe-ayi, ekwem. O we kpọ isi ala nye Ya.


Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.


Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan