Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 2:13 - Bible Nso

13 Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n'Ijipt, nọ n'ebe ahu rue mb͕e ọ bula m'gāgwa gi: n'ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 2:13
29 Iomraidhean Croise  

Hedad we b͕alaga, ya onwe-ya na ndikom Edom ufọdu n'etiti ndi-orù nna-ya tiyere ya, ibà n'Ijipt; ma Hedad bu nwa-okoro ntà.


Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.


Na nrọ, bú ọhù nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu, N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;


Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya, Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;


Fero we nye ndi-ya nile iwu, si, Nwa-nwoke ọ bula amuru, n'osimiri Nail ka unu gētufu ya, ma unu gēdebe nwa-nwayi ọ bula ndu.


Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.


Ma mb͕e ọ bula ha sob͕uru unu n'obodo a, b͕alaga n'obodo di iche: n'ihi na n'ezie asim unu, Unu agaghi-agazù obodo nile nke Israel ma-ọli, rue mb͕e Nwa nke madu gābia.


Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n'uzọ ọzọ.


O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya n'abali, wezuga onwe-ya ga Ijipt;


Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe.


Ma mb͕e ọ nuru na Akeleọs bu eze Judia n'ọnọdu nna-ya Herod, ọ turu egwu ije ebe ahu; ma ebe Chineke duru ya ọdú na nrọ, o wezugara onwe-ya ga n'akuku Galili,


Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta.


Ma mb͕e mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu lasiri, ọ kpọ madu abua nime ndi nējere ya ozi, na otù onye-agha nke nāsọpuru Chineke nime ndi nānọgide ya nso mb͕e nile;


Mb͕e Pita mara onwe-ya, ọ si, Ub͕u a ka m'matara n'ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n'aka Herod, ya na ile-anya nile nke ndi-Ju.


Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua.


Onye-nche ulo-nkpọrọ ahu we kọrọ Pọl okwu ndia, si, Ndi-ikpé ezitewo ka arapu unu la: ya mere putanu ub͕u a, la kwa n'udo.


Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n'abali, we duputa ha, si,


Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu.


Ọ gēru kwa, mb͕e ọbu-ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e Jehova, bú Onye-nwe uwa nile, gēzu ike nime miri Jọdan, na agēbipu miri Jọdan, bú miri nke nēsi n'elu rida; ha gēguzo kwa n'otù obo.


Ndi-nchu-aja ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we guzo n'ala-akọrọ n'etiti Jọdan, Israel nile we nagabiga n'ala-akọrọ, rue mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan.


Ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ahu nēguzo kwa n'etiti Jọdan, rue mb͕e emezuru okwu ahu nile nke Jehova nyere Joshua n'iwu igwa ndi Israel, dika ihe ahu nile si di nke Moses nyere Joshua n'iwu: ndi Israel we me ngwa gabiga.


O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova siri n'etiti Jọdan rigota, mb͕e ndi-nchu-àjà sepuru ọbu-ukwu-ha rue ala-akọrọ, na miri Jọdan laghachiri n'ọnọdu-ya, we ruchie akuku-ya nile, dika na mb͕e gara aga.


Ewe nye nwanyi ahu nkù abua ahu nke oké ugo ahu, ka o we febà n'ọhia la n'ọnọdu-ya, ebe anāzù ya otù oge, na oge abua, na nkera otù oge, ka ọ pua n'iru agwọ ahu.


Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.


Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n'aka Chineke, ka ha we zùa ya n'ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan