Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 19:8 - Bible Nso

8 Ọ si ha, Ọ bu n'ihi obi-etili-unu ka Moses kwere ka unu rapu nwunye-unu: ma site na nmalite adighi-eme otú a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 19:8
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru.


Noa we si n'iru miri nke iju-miri ahu ba n'ub͕ọ ahu, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom.


Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba, Dika n'ubọchi Masa n'ọzara:


Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.


Ọ bu kwa obi-ha ka ha mere ka ha ghọ nkume adamant, ka ha we ghara inuru iwu Chineke, na okwu nile nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha zitere site na Mọ-Ya site n'aka ndi-amuma mbu: oké iwe we site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha bia.


Ha si Ya, Gini kwa ka Moses ji nye iwu inye akwukwọ nkewa, na irapu ya?


Ma asim unu, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko: onye nke gālu nwanyi ahu mb͕e arapuworo ya nākwa kwa iko.


Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n'ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya.


Ndi-mọ ọjọ ahu we riọ Ya, si, Ọ buru na I chupuru ayi, ziga ayi nime ìgwè ezì ahu.


Ma Jisus siri ha, N'ihi obi-etili-unu ka o dere unu iwu a n'akwukwọ.


Emesia emere ka Ọ puta ìhè nye ndi-ozi iri na otù onwe-ha mb͕e ha nọduru na nri; O we ta ekweghi-ekwe-ha na obi-etili-ha uta, n'ihi na ha ekweghi okwu ndi huru Ya mb͕e emesiri ka O si n'ọnwu bilie.


Ma anamekwu nka n'uzọ nkweye, ọ bughi n'uzọ ihe enyere n'iwu.


Devid kuru-kwa-ra Ahinoam nke Jezreel; ha we ghọrọ ya nwunye, ọbuná ha abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan