Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 19:4 - Bible Nso

4 O we za, si, Ùnu agughi na Onye kère ha site na nmalite mere ha nwoke na nwayi,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 19:4
15 Iomraidhean Croise  

Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.


Jehova, bú Chineke, we si, Ọ dighi nma ka madu ahu nọ nání ya; M'gēmere ya onye-iye-aka kwesiri ya.


Madu ahu we si, Ehe! nka bu nọ ọkpukpu si n'ọkpukpum puta, na anu-aru si n'anu-arum puta: nka ka agākpọ Nwayi, n'ihi na eweputara nka n'aru Nwoke.


nwoke na nwayi ka O kere ha; Ọ gọzie ha, kpọ aha-ha Madu, n'ubọchi ekere ha.


Jehoiada we lutara ya ndinyom abua; o we mua umu-ndikom na umu-ndinyom.


Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.


Ma Ọ siri ha, Ùnu agughi ihe Devid mere, mb͕e agu guru ya, na ndi soro ya;


Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?


Ndi ahu ndi nēso uzọ-Ya we ga, me dika Jisus nyere ha iwu,


Ma n'okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ùnu agughi okwu Chineke gwara unu, si,


Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ; Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:


Ma n'okwu bayere ndi nwuru anwu, na anēme ka ha si n'ọnwu bilie; ùnu agughi n'akwukwọ Moses, n'ebe edere okwu bayere Osisi ntà, otú Chineke gwara ya, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob?


O we si ha, Ọ dighi mb͕e ọ bula unu guru ihe Devid mere, mb͕e ọ nọ na nkpà, mb͕e agu gu-kwa-ra ya, ya onwe-ya, na ndi soro ya?


O we si ya, Gini ka edeworo n'akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya?


Jisus we za ha, si, Ùnu agughi ọbuná ihe a, nke Devid mere, mb͕e agu guru ya, ya onwe-ya na ndi soro ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan