Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 19:13 - Bible Nso

13 Mb͕e ahu ekutara Ya umu-ntakiri, ka O we bikwasi ha aka-Ya abua, kpe kwa ekpere: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 19:13
15 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na otù onye siri Josef, Le, nna-gi nāria ọria: o we chiri umu-ya ndikom abua ka ha so ya je, bú Manase na Efraim.


M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma:


Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba, si, Chineke mere Gi ebere, Onye-nwe-ayi: ihe a agaghi-adiri Gi ma-ọli.


N'ihi na ndi-onozi di, ndi amuru otú a site n'afọ nne-ha: ndi-onozi di kwa, ndi emere onozi site n'aka madu: ndi-onozi di kwa, ndi mere onwe-ha onozi n'ihi ala-eze elu-igwe. Onye puru inagide ya, ya nagide.


Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.


N'ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n'ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya.


N'ihi na edowo di nēkweghi ekwe nsọ nime nwunye-ya, edowo kwa nwunye nēkweghi ekwe nsọ nime nwa-nna-ayi nwoke: n'ihi na, ma ọ dighi otú a, umu-unu gābu umu nādighi ọcha; ma otú ọ di, ha di nsọ.


Ma mb͕e o mere ka ọ rapu ara, o we kuru ya n'aka-ya rigo, chiri kwa oke-ehi atọ, na otù ephah utu ọka, na otù karama-akpukpọ manya-vine, we me ka ọ ba n'ulo Jehova na Shailo: nwata ahu bu nání nwata.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan