Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 18:8 - Bible Nso

8 Ma ọ buru na aka-gi ma-ọbu ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu n'ọlusi ma-ọbu na ngwurọ, kari inwe aka abua ma-ọbu ukwu abua atubà i n'ọku ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 18:8
22 Iomraidhean Croise  

Unu gēmeru kwa ihe amachitara arusi ọla-ọcha gi nile apiri api, na ihe awuchitara arusi ọla-edo gi awuru awu: i gātusa ha dika ihe ruru inyi; i gāsi ya, Pua.


Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?


Tupunu n'aru unu njehie nile unu nke unu jehieworo nime ha; mere onwe-unu obi ọhu na mọ ọhu: ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.


Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:


Ndia gāpu je ba n'ahuhu-nmehie ebighi-ebi: ma ndi ezi omume gābà na ndu ebighi-ebi.


Ya mere otú a, onye ọ bula nime unu nke nāb͕akutaghi ihe nile o nwere azú, ọ pughi ibu onye nēso uzọm.


Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n'ihi na anọm n'aru-ufu nime ire-ọku a.


Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.


ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu:


Ọ buru kwa na ahughi onye ọ bula ka edereri aha-ya n'akwukwọ nke ndu ahu, ewe tubà ya n'ọdọ ọku ahu.


Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan