Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 18:4 - Bible Nso

4 Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n'ala-eze elu-igwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 18:4
13 Iomraidhean Croise  

N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.


N'oge hour ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Ònye kwa dikariri uku n'ala-eze elu-igwe?


si, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu echigharighi, bia di ka umu-ntakiri, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli.


Ọzọ, onye ọ bula nke gānara otù nwatakiri di otú a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma:


Ma ọ dighi otú a n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi:


Ma ha kpuchiri ọnu-ha: n'ihi na ha nārurita uka n'uzọ onye ka ibe-ya n'etiti ha.


N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n'ihi na onye dikari ntà n'etiti unu nile, onye ahu bu onye uku.


Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.


Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan