Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 18:35 - Bible Nso

35 Otú a ka Nnam nke elu-igwe gēme kwa unu, ọ buru na unu ab͕agharaghi, onye ọ bula nmehie nwa-nne-ya, site n'obi-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 “Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 18:35
16 Iomraidhean Croise  

Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike, Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.


Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua: Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.


Ma ọbuná n'ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ bu kwa obi-ha ka ha mere ka ha ghọ nkume adamant, ka ha we ghara inuru iwu Chineke, na okwu nile nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha zitere site na Mọ-Ya site n'aka ndi-amuma mbu: oké iwe we site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha bia.


Onye-nwe-ya were iwe, we rara ya nye n'aka ndi-nmekpa-aru, rue mb͕e ọ gākwughachi ugwọ nile o ji.


B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ.


Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu.


Ma ọ buru na unu onwe-unu ab͕agharaghi, Nna-unu Nke bi n'elu-igwe agaghi-ab͕aghara unu ndahie nile unu.


O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n'anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n'ihi na ihe di elu n'etiti madu bu ihe-árú n'anya Chineke.


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu.


Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua.


M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan