Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 18:24 - Bible Nso

24 Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 18:24
17 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Ub͕u a kwa, dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi: onye agāchọta ya n'aka-ya gāburum orù; ma unu onwe-unu gābu ndi puru ya.


Ha we nye iji fè òfùfè ulo Chineke ọla-edo nnù talent iri-na-abua na ọgu iri, na orú nnù darie na nnù ise, na ọla-ọcha orú nnù talent na nnù ise, na ọla orú nnù uzọ abua na nnù ise, na ígwè orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri.


M'we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n'ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n'ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe.


N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim: Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.


N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu, Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ; Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam.


N'ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie.


Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ.


Otù ka ọ nyere talent ise, nke-ọzọ talent abua, nke-ọzọ otù talent; o nye onye ọ bula dika ike nke aka ya ra; o we je inọdu n'ala ndi ọzọ.


Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.


Onye ahu nke nara talent ise we biakute ya weta talent ise ọzọ, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent ise nyem n'aka: le, eritaram talent ise ọzọ n'urù.


Onye nara talent abua ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, i rara talent abua nyem n'aka: le, eritaram talent abua ọzọ n'urù.


Onye narari otù talent ahu we biakute kwa ya, si, Onye-nwe-ayi, amaram i na i bu madu aka ike, nēwe ihe ubi n'ebe i nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe i nāfuchagh:


Ma-ọbu madu iri na asatọ ahu, ndi ulo-elu di na Sailoam dakwasiri ha, we b͕ue ha, ùnu nēchè na ndi ahu bu ndi ji ugwọ kari madu nile ndi bi na Jerusalem?


O we kpọ ndi nile ji onye-nwe-ya ugwọ n'otù n'otù, si onye mbu, Ùgwọ ole ka i ji onye-nwem?


Mb͕e ahu ọ siri onye ọzọ, Ùgwọ ole ka gi onwe-gi ji kwa? Ọ si, Ọgu mb͕é ọka ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, de ọgu anọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan