7 Jisus we biakute ha, metu ha aka, si, Bilienu, unu atu-kwa-la egwu.
7 Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.”
Ma, le, otù aka meturum, me ka m'guzo nāṅaghari n'elu ikperèm abua na ọbu-akam abua.
Otù onye nke di ka madu n'ile ya anya we metukwam aka ọzọ, me ka m'di ike.
Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we di n'oké ura da kpue irum n'ala: o we metum aka, me ka m'guzo ọtọ n'ebe m'nēguzo.
e, mb͕e mu onwem nọ nēkwu okwu n'ekpere, onye ahu, bú Gebriel, onye m'hururi n'ọhù n'isi-nmalite, ebe emere ka o feb͕ue onwe-ya n'ufe, o we nērutum aru n'ihe dika mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.
Ma ngwa ngwa Jisus gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu: unu atula egwu.
Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ha we da kpuchie iru-ha n'ala, tu kwa egwu ri nne.
Ma mb͕e ha weliri anya-ha elu, ha ahughi onye ọ bula, ma-ọbughi nání Jisus.
ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n'ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n'etiti ndi nwuru anwu?
ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime.
Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,