Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 17:23 - Bible Nso

23 ha gēb͕u kwa Ya, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. O we wuta ha ri nne.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 17:23
18 Iomraidhean Croise  

N'ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim; I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi.


Ikem akpọwo nku di ka osisi; Irem nārapara kwa n'ab͕am; Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.


Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.


Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n'efu di iche iche.


Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.


Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n'aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubochi nke-atọ.


Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie.


rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.


si, Onye-nwe-ayi, ayi chetara na Onye-nduhie ahu siri, mb͕e Ọ nọ na ndu, Mb͕e ubọchi atọ gasiri M'gēsi n'ọnwu bilie.


O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.


Ha we si n'ebe ahu pua, gabiga n'etiti Galili; Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara.


Kama n'ihi na M'gwawo unu okwu ndia, ihe-nwuta ejuputawo obi-unu.


Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan