Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 17:12 - Bible Nso

12 ma asim unu, na Elaija abiawori ub͕u a, ha amazughi kwa ya, kama ha mere n'aru-ya ka ihe ha chọrọ ra. Ọbuná otú a ka ha gaje ime kwa ka Nwa nke madu hu ahuhu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 17:12
25 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e Jọn nuru n'ulo-nkpọrọ ọlu nile nke Kraist ahu, o ziga ozi site n'aka ndi nēso uzọ-ya,


Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n'aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubochi nke-atọ.


O we za, si, Ọ bu ezie na Elaija nābia, Ọ gēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu:


Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya ghọtara na Ọ gwara ha okwu bayere Jọn Baptist.


Ma mb͕e ha bi na Galili, Jisus siri ha, Agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu;


Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie.


N'ihi na Jọn biakutere unu n'uzọ ezi omume, ma unu ekweghi ya: ma ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko kwere ya: ma mb͕e unu huru ya, unu onwe-unu akwaghi uta ọbuná emesia, ka unu we kwere ya.


Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.


N'ihi na Jọn Baptist abiawo nērighi achicha nāṅughi kwa manya-vine; unu we si, O nwere mọ ọjọ.


Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbataghi Ya.


Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:


ka eme ka unu nile na ndi Israel nile mara, na ọ bu n'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe, Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n'aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n'iru unu n'ebe a.


Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan