Anēsite n'irum nye iwu, si, n'ebe nile ọ bula anāchi n'ala-ezem, ka madu nāma jijiji nātu egwu n'iru Chineke nke Daniel: N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, Ọ nēguzosi kwa ike rue mb͕e nile ebighi-ebi, ala-eze-Ya bu kwa nke anāgaghi-emebi, ọchichi-Ya gādigide kwa rue ọgwugwu ihe nile:
Ma ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, na ndi ha na ya nọ nēche Jisus, mb͕e ha huru ala-ọma-jijiji ahu, na ihe nile emere, ha tua egwu ri nne, si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.
Ma O kpuchiri ọnu, ọ dighi kwa ihe ọ bula Ọ zara. Onye-isi-nchu-àjà juba-kwa-ra Ya ọzọ, si Ya, Gì onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara nke Onye ahu agọziri agọzi?
nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:
N'ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n'etiti unu site n'ọnu-ayi, bú site n'ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya.
ebe emere ka unu puta ìhè na unu bu akwukwọ-ozi Kraist, nke ayi jere ozi ya, nke anējighi ink de, kama ọ bu Mọ nke Chineke di ndu ka eji de ya; ọ bughi n'elu mbadamba nkume, kama ọ bu n'elu mbadamba ihe di iche, bú obi nke anu-aru.
Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.
N'ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n'ebe unu nọ; ya na otú unu siri n'arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu,
N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.
ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?
Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.
M'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi n'ọwuwa-anyanwu rigo, nēnwe akàrà nke Chineke di ndu; o we were oké olu tiere ndi-mọ-ozi anọ ahu nkpu, bú ndi enyere ha ike imejọ uwa na oké osimiri,