15 Ọ si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu?
15 Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.
Ha we si, Ufọdu si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ibe-ha si, Jeremaia, ma-ọbu otù nime ndi-amuma.
Saimon Pita we za, si, Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu.
Ya onwe-ya we jua ha, si, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si Ya, Gi onwe-gi bu Kraist ahu.
O we si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si, Kraist nke Chineke.