Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 16:13 - Bible Nso

13 Ma mb͕e Jisus biara n'akuku Sisaria Filipi, Ọ jua ndi nēso uzọ-Ya, si, Ònye ka madu nāsi na Nwa nke madu bu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 16:13
23 Iomraidhean Croise  

Anọm nāhu n'ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n'igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n'iru Ya.


Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya; ma onye ọ bula nke gēkwu megide Mọ Nsọ, agaghi-ab͕aghara ya, ọ bughi n'oge a, ọ bughi kwa n'oge nke gaje ibia.


n'ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n'afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n'obi nke ala ubọchi atọ ehihie na abali.


N'ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.


O we za, si, Onye nāgha nkpuru ọma ahu bu Nwa nke madu;


Nwa nke madu gēzipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gāchikọputa n'ala-eze-Ya ihe nile nēme ka ama n'ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu,


Jisus we si n'ebe ahu pua, wezuga Onwe-ya ga n'akuku Taia na Saidon.


N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di.


N'ezie asim unu, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ha gāhu Nwa nke madu ka Ọ nābia n'ala-eze-Ya.


Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n'ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya:


Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.


Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (mb͕e ahu Ọ siri onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), Bilie, chiri ihe-ndina-gi, la n'ulo-gi.


N'ihi na Nwa nke madu Onwe-ya abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.


N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n'ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.


Ọ si kwa ya, N'ezie, asim unu, Unu gāhu elu-igwe ka emegheworo ya, hu kwa ndi-mọ-ozi nke Chineke ka ha nārigo nārida kwa n'aru Nwa nke madu.


Ya mere ìgwè madu ahu zara Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru site n'iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: Gì onwe-gi si kwa aṅa si, Aghaghi iweli Nwa nke madu elu? Ònye bu Nwa nke madu a?


Ma dika Moses weliri agwọ n'ọhia, ọbuná otú a aghaghi iweli Nwa nke madu elu:


O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu.


bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.


o we si, Le, anamahu elu-igwe ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan