Onye-nwe-ayi we si, N'ihi na ndi nka abiaruwo nso n'ọnu-ha, were kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ha sọpurum, ma ha emewo ka obi-ha di anya n'ebe M'nọ, egwu ha nāturum ewe buru ihe madu nyere n'iwu nke emere ka ha muta:
Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.
Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha, Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.
N'ihi na, Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya, Na ihu ezi ubọchi, Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ: