32 Mb͕e ha rigoro n'ub͕ọ, ifufe we febìe.
32 Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara.
Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n'ìhi gini ka i ji nwe obi abua?
Ma ndi nọ n'ub͕ọ ahu kpọrọ isi ala nye Ya, si, I bu Ọkpara Chineke n'ezie.
Ha we tua oké egwu, sirita onwe-ha, Ònye bu kwa onye a, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?
O we rigokuru ha n'ub͕ọ; ifufe we febìe: ibobo we nwubiga ha ókè n'aru ri nne n'onwe-ha;
Ya mere ha chọrọ iwebata Ya nime ub͕ọ-ha: ngwa ngwa ub͕ọ-ha we rue ala ebe ha nāga.