atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.
Atula egwu, gi idide, bú Jekob, unu ndikom Israel; Mu onwem eyeworo gi aka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ọzọ, Onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel.
Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;
Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.
otú ahu ka ibobo nwu-kwa-ra Jemes na Jọn, umu Zebedi, n'aru, ndi ha na Saimon bu ndi-nnweko. Jisus we si Saimon, Atula egwu; site n'ub͕u a i ganānwuta madu na ndu.
Ma n'abali soni Onye-nwe-ayi guzoro n'akuku ya, si, Nwe obi-ike: n'ihi na dika i kwuru okwu bayerem si-ike na Jerusalem, i ghaghi ib͕a kwa àmà otú a na Rom.