Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n'ihe ọ bula ma-ọbughi nání n'urù nēzighi ezi gi, na n'iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n'imeb͕u emeb͕u, na n'izọpia-azọpia, ime ya.
n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie nání ọbara ka M'gēme gi ka i ghọ, ọbara ganāchu kwa gi: ọ bu ezie na i kpọghi ọbara asì, ma ọbara gāchu gi.