Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 13:57 - Bible Nso

57 Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. Ma Jisus siri ha, Onye-amuma abughi onye anādighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'ulo nke aka ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

57 Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 13:57
19 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa Israel na Onye Nsọ ya, siri onye madu nēleda, onye bu ihe-árú nke mba nka, onye bu orù ndi nāchi achi: Ndi-eze gāhu, we kpọ isi ala; n'ihi Jehova Nke kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye Nsọ nke Israel, Nke rọputaworo gi.


Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n'ihe.


Ọ gāghọ kwa ebe nsọ; ma Ọ gāghọrọ ulo abua nke Israel nkume ikpọbì-ukwu na oké nkume isu-ngọngọ, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem ib͕udu na ọnyà.


Ngọzi nādi-kwa-ra onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.


Ọ lughi kwa ọtutu ọlu di ike n'ebe ahu n'ihi ekweghi-ekwe-ha.


O we si n'ebe ahu pua; O we bia n'ala nke aka Ya; ndi nēso uzọ-Ya so kwa Ya.


Herod, bú eze, we nu, n'ihi na aha-Ya putara ìhè: o we si, Jọn onye nēme baptism, emewo ka o si na ndi nwuru anwu bilie, n'ihi nke à ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya.


Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya.


Jisus we si ha, Onye-amuma abughi onye adighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'etiti ikwu-ya, na n'ulo-ya.


O we si, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye-amuma ọ bula nke anara nke-ọma n'obodo nke aka ya.


Ngọzi nādikwara onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.


N'ihi na Jisus onwe-ya b͕ara àmà, na adighi-asọpuru onye-amuma n'ala nke aka ya.


Ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Jisus, Nwa Josef, Onye ayi onwe-ayi mara nna-Ya na nne-Ya? Ò si aṅa kwue ub͕u a, Esiwom n'elu-igwe ridata?


Ma ebe Jisus mara n'Onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya nātamu ntamu n'ihi nka, Ọ siri ha, Ọ̀ bu nka nēme ka unu ma n'ọnyà?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan