1 N'ubọchi ahu Jisus puru n'ulo, we nọdu n'usọ oké osimiri.
1 Nʼotu ụbọchị ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nʼọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala.
N'ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.
Mb͕e ahu Ọ rapuru ìgwè madu nile, we bà n'ulo-ha: ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Kọrọ ayi isi ilu ata di n'ubi ahu.
Ma mb͕e Ọ batasiri n'ulo, ndi-ìsì ahu biakutere Ya: Jisus we si ha, Ùnu kwere na apurum ime ihe a? Ha si Ya, E, Onye-nwe-ayi.
O we pua ọzọ ga n'usọ oké osimiri; ìgwè madu ahu nile we nābiakute Ya, Ọ nēzí kwa ha ihe.