Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 12:42 - Bible Nso

42 Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ya ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomon; ma le, Onye ka Solomon nọ n'ebe a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

42 Nʼụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị nke Ndịda ga-eso ọgbọ a bilie boo ya ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nʼihi na o siri nʼebe dị ụwa sọtụrụ bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nʼebe a, ma unu jụrụ i kwere na ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 12:42
22 Iomraidhean Croise  

Uwa nile we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n'obi-ya.


le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.


Israel nile we nu ikpe eze kpere; ha we tua egwu eze: n'ihi na ha huru na amam-ihe Chineke di nime ya, ime ihe ekpere n'ikpe.


Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?


Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke-uku, na obi sara mbara, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri.


Ha we si na ndi nile bia inu amam-ihe Solomon, si n'eze nile nke uwa, bú ndi nuru amam-ihe-ya.


Jehova nye-kwa-ra Solomon amam-ihe, dika Ọ gwara ya; udo we di n'etiti Hairam na Solomon; ha abua we b͕a ndu.


N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.


Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.


Ma asim unu, na Onye di uku kari ulo Chineke nọ n'ebe a.


Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.


ma le, olu sitere n'elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.


Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.


Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.


Ọ dighi kwa n'ofè oké osimiri, ka i we si, Ònye gāgabigara ayi n'ofè oké osimiri, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan