21 Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.
21 Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”
Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.
Ọ gaghi-enwu inyoghi-inyoghi, agaghi-apia kwa ya apia n'obi, rue mb͕e o gēdowori ikpé n'uwa; ọ bu kwa iwu-ya ka agwe-etiti nile gēchere.
Mb͕e ahu ekutara Ya otù onye mọ ọjọ ji, bú onye kpuru ìsì nke da-kwa-ra ob͕i: O we me ka aru-ya di ike, ya mere onye-ob͕i ahu kwuru okwu hu kwa uzọ.
ndi Chineke chọrọ ime ka ha mara ihe bu àkù nke ebube nke ihe-omimi a n'etiti ndi mba ọzọ, nke bu Kraist nime unu, bú olile-anya nke ebube ahu: