Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 12:14 - Bible Nso

14 Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 12:14
15 Iomraidhean Croise  

ha we b͕akọ ìzù ka ha we were aghughọ jide Jisus, b͕ue Ya.


Ma mb͕e o ruru ututu, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nile nke ndi-Ju b͕ara ìzù megide Jisus ime ka Ọ nwua:


Ma ememe ngabiga na achicha ekoghi-eko gādi mb͕e ubọchi abua gasiri: ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi jide Ya n'aghughọ, b͕ue Ya:


Ndi-Farisi we pua, ngwa ngwa ha na ndi Herod we b͕a ìzù megide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.


Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi b͕u Ya; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju.


Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.


Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya.


Ha we chọ kwa uzọ ijide Ya: O we pua n'aka-ha.


Ya mere site n'ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya.


Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi nyereri iwu ka, ọ buru na onye ọ bula mara ebe Ọ nọ, ka o gosi ya, ha we jide Ya.


Ya mere n'ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n'ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra.


Ya mere ha chọrọ uzọ ijide Ya: ọ dighi kwa onye ọ bula tukwasiri Ya aka, n'ihi na oge hour Ya akābiaghi.


Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya.


Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka.


Ya mere ha tuturu nkume itu Ya: ma Jisus zobere Onwe-ya, we si n'ulo uku Chineke pua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan