Ahuhu gādiri uwa site n'ihe di iche iche nēme ka madu ma n'ọnyà; n'ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà nēsite n'aka-ya bia.
Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.
Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ.
Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya.
Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;
Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha.