Matiu 11:28 - Bible Nso28 Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a28 “Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. Faic an caibideil |
Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.