Ọzọ, n'aru ndi-amuma Jerusalem ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n'okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n'ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.
Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, emeghi, ya onwe-ya ma-ọbu umu-ya ndinyom, otú i meworo, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom.
Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu unu: unu gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara okè kari ndi ọzọ.