Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 11:17 - Bible Nso

17 si, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi aka n'obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu ekweghị ete egwu. Anyị bụụrụ unu abụ ịkwa ozu, ma unu akwaghị akwa.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 11:17
15 Iomraidhean Croise  

Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.


Ndi Israel nile we so ya n'azu rigo, ndi Israel nēb͕u kwa ọ̀jà, nāṅuri kwa oké ọṅù, ala we b͕awa n'olu-ha.


Abù ka unu gēnwe dika n'abali edoworo ememe nsọ; na ọṅù obi, dika nke onye ji ọ̀jà eje ibà n'ugwu Jehova, rue Oké Nkume nke Israel.


M'gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua.


Ma M'gēji ọb͕ọ a tuyere gini? O yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, ndi nākpọ ibe-ha òkù,


N'ihi na Jọn biara nērighi ihe-oriri nāṅughi kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, O nwere mọ ọjọ.


Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru iru újú ka oge ahu ra, bú mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu.


Mb͕e Jisus biara n'ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù,


Ma nwa-ya nke-okenye nọ n'ubi: mb͕e ọ nābia ru ulo nso, o we nu olu abù na ite-egwú.


Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n'obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá.


Ha yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, nākpọ kwa ibe-ha òkù; ndi nāsi, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi mkpu ákwá.


Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n'obi n'ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n'ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan