Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 10:7 - Bible Nso

7 Mb͕e unu nāga, nēkwusanu, si, Ala-eze elu-igwe di nso.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 10:7
19 Iomraidhean Croise  

Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;


Menu ndi aru-ha nādighi ike ka aru di ha ike, menu ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, menu ndi-ekpenta ka ha di ọcha, chupunu ndi-mọ ọjọ: n'efu ka unu natara, nyenu n'efu.


O rue, mb͕e Jisus nyebìri ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya iwu, O si n'ebe ahu pua izí ihe na ikwusa n'obodo nile ha.


Ònye nime ha abua mere ihe nna-ya chọrọ? Ha si, Onye mbu. Jisus si ha, N'ezie asim unu, na ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abà n'ala-eze Chineke.


N'ihi nka ka M'ji si unu, Agānara unu ala-eze Chineke, we nye mba ọzọ nke nāmi nkpuru-ya.


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.


Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.


Ha we pua, kwusa ka madu chègharia.


Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n'oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n'otù n'otù were ihe-ike nābà nime ya.


O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike.


Ha we pua, we nējezu obodo ntà ahu nile, nēzisa ozi ọma Ya, nēme kwa ka aru madu di ike n'ebe nile.


Ma Ọ siri ya, Rapu ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu; ma gi onwe-gi je zisa ozi ala-eze Chineke.


Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya.


Ma mb͕e o ruru na Pita batara, Kọniliọs zutere ya, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala nye ya.


nēkwusa ala-eze Chineke, nēwere kwa nkwuwa-okwu nile zí ihe nile bayere Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ọ dighi onye nēb͕ochi ya.


ebe ike gwuru ha nọ̄ n'ihi na ha nēzi ndi-Ju ihe, nēkuwsa kwa nime Jisus nbilite site na ndi nwuru anwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan