Devid we si Abishai, si kwa ndi-orù-ya nile, Le nwam, nke siri n'afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ò gēsi kwa aṅa ghara ichọkari ya ub͕u a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n'ihi na Jehova siworo ya, Kọcha.
M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.
N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n'udo, ndi nēche nche n'akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n'aru ya.
Elaiab, bú nwa-nne-ya nke-okenye, we nu mb͕e ọ nāgwa ndikom ahu okwu; iwe Elaiab we di ọku megide Devid, ọ si, N'ìhi gini kwa ka i ridataworo? ọ̀ bu kwa n'aka onye ka i rapuru aturu ole-na-ole ahu n'ọzara? mu onwem mara nganga-gi, na ihe ọjọ nke obi-gi; n'ihi na ọ bu ihu agha ka i ridataworo.