Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a.
Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n'ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n'obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n'ebe mu, bú onye-nmehie, nọ.
Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n'otù ebe.
Mb͕e ha batara n'obodo, ha we rigo n'ime-ulo di n'elu ulo, ebe ha nānọ; Pita na Jọn na Jemes na Andru, Filip na Tomas, Batọlọmiu na Matiu, Jemes nwa Alfiọs, na Saimon Zilotis, na Judas nwa Jemes.
Ma mb͕e o kpukpusiri ha aka ikpuchi ọnu-ha, ọ kọrọ ha otú Onye-nwe-ayi duputara ya-ri n'ulo-nkpọrọ. Ọ si, Kọrọ Jemes na umu-nna-ayi ihe ndia. O we pua, ga ebe di iche.
mb͕e ha hukwara amara enyerem, Jemes na Kifas na Jọn, bú ndi akpọrọ ide, nara mu na Banabas aka-nri nke nnwekọ, ka ayi onwe-ayi we jekuru ndi mba ọzọ, ka ha onwe-ha we jekuru kwa ndi obibì-úgwù;
Judas, orù nke Jisus Kraist, na nwa-nne Jemes, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi akpọworo, ndi ahuru n'anya nime Chineke, bú Nna-ayi, ndi edebewo kwara Jisus Kraist: