Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 10:17 - Bible Nso

17 Ma nēzenu madu: N'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche, n'ulo-nzukọ nile ha ka ha gāpia kwa unu ihe;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Kpachapụnụ anya. Nʼihi na a ga-enyefe unu nʼaka nzukọ ndị ụlọ ikpe, pịaakwa unu ihe nʼụlọ ekpere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 10:17
26 Iomraidhean Croise  

Unu ekwerela n'eyì, unu atukwasila eyì unu mara nke-ọma obi: debe eb͕ub͕ere-ọnu-gi ghara igwa nwanyi nēdina n'obi-gi okwu.


e, n'iru ndi-isi na ndi-eze ka agēkuru kwa unu je n'ihim, iburu ha na ndi mba ọzọ àmà.


rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.


N'ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n'obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n'ulo-nzukọ-unu, si kwa n'otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ:


Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà ugha imegide Jisus, ka ha we me ka Ọ nwua;


ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.


Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'aka ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye; umu gēbili kwa imegide ndi muru ha, me kwa ka ha nwua ọnwu.


Ma unu onwe-unu lezie anya n'onwe-unu: n'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n'ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n'iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n'ihim, iburu ha àmà.


Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n'iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu:


Ya mere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi kpọrọ nnọkọ-ikpé ka ha zukọ, si, Gini ka ayi nēme? n'ihi na Nwoke a nēme ọtutu ihe-iriba-ama.


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n'ebe ahu.


Mu onwem we si, Onye-nwe-ayi, ha onwe-ha mara na mu onwem nātubà ndi kwere na Gi n'ulo-nkpọrọ, nēti kwa ha ihe n'ulo-nzukọ nile n'otù n'otù:


Esite-kwa-ram n'ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n'ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m'we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n'azu ala-ayi.


riọ akwukwọ-ozi n'aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n'Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u bia Jerusalem.


Lezienu nkita ahu nile anya, lezienu ndi-ọlu ọjọ ahu anya, lezienu obibì-aru ahu anya:


gi onwe-gi nēche kwa onye ahu nche; n'ihi na o guzogidere okwu-ayi nke-uku.


ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan