12 Mb͕e unu nābà n'ulo ahu, kelenu ya.
12 Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu.
Ka udo di n'ékpè-gi nile, Ka inọ-n'udo di kwa n'ulo-gi nile di elu.
N'ihi umu-nnem na ndi-eyìm, Biko, ka m'kwue okwu, si, Ka udo di nime gi.
Ma ha onwe-ha, ma ha gānu, ma ha gāghara, (n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu,) ha gāmara na onye-amuma anọwo n'etiti ha.
Ma obodo ọ bula ma-ọbu obodo ntà ọ bula unu gābà nime ya, chọputanu onye kwesiri nime ya; nọgidenu n'ebe ahu rue mb͕e unu putara.
Ọ buru kwa na ulo ahu kwesiri, ka udo-unu biakwasi ya: ma ọ buru na o kwesighi, ka udo-unu laghachikute unu ọzọ.
Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile)
Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù.
ma anamele anya ihu gi ngwa ngwa, ayi gēwere kwa ọnu kwurita okwu.
si kwa ya otú a, Ndu-gi! gi onwe-gi, udo; ulo-gi, udo kwa; ihe nile i nwere, udo kwa.