8 Esa we mua Jehoshafat; Jehoshafat we mua Joram; Joram we mua Uzaia;
8 Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa.
Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid, bú nna-ya: Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
Ndi nile nke Juda we were Azaraia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia.
Ma Jehoram nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asatọ nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze arọ iri na abua.
Ma n'arọ nke-ise nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, mb͕e Jehoshafat bu kwa eze Juda, Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda, malitere ibu eze.
Joram nwa-ya, Ehazaia nwa-ya, Joash nwa-ya;
Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.
Solomon we mua Rehoboam; Rehoboam we mua Abaija; Abaija we mua Esa;
Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia;