Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 1:6 - Bible Nso

6 Jesi we mua Devid, bú eze. Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 1:6
25 Iomraidhean Croise  

Devid we zìe jua ajuju bayere nwayi ahu. Otù onye we si, Nwayi a, ọ̀ bughi Bat-sheba, nwa-nwayi Eliam, bú nwunye Urai onye Het?


Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid. Ihe nke si n'ọnu Devid nwa Jesi puta, Na ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie, Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu, Na onye nwere olu di utọ n'ibù abù ọma Israel:


Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.


n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het.


Uraia onye Het, Zabad nwa Ahlai;


Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon;


na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa:


ma n'etiti umum ndikom nile, (n'ihi na ọtutu umu-ndikom ka Jehova nyerem,) O we rọputa Solomon nwam inọkwasi n'oche-eze nke ala-eze Jehova dika onye-isi Israel.


Ma ndia ka amuru nye ya nime Jerusalem: Shimea, na Shobab, na Netan, na Solomon, anọ, bú nke Bat-shua nwa-nwayi Amiel:


Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.


Ome gēsi kwa n'ogwe-osisi Jesi puta, otù alaka nke sitere na nkpọrọgwu-ya gāmi kwa nkpuru:


Salmon we mua Boaz site na Rehab; Boaz we mua Obed site na Rut; Obed we mua Jesi;


N'ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n'anu-aru, Chineke mere, n'ihi na Ọ mara nmehie ikpé n'anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n'oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n'ihi nmehie:


Obed we mua Jesi, Jesi we mua Devid.


Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.


Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl.


Sọl we si ya, Nwà onye ka i bu, gi nwa-okorọbia? Devid we si, Nwa orù-gi, bú Jesi, bú onye Bet-lehem, ka m'bu.


na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m'nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n'obi n'ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m'nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan