25 ọ maghi kwa ya rue mb͕e ọ muputara Nwa-nwoke: o we kpọ aha-Ya Jisus.
25 Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.
Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.
Nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma nke-uku; o we nēkposo eze aru ọku, je-kwa-ra ya ozi; ma eze amaghi aru-ya.
Dorom nwa ọ bula eburu uzọ mu nsọ, bú nwa meghere àkpà-nwa ọ bula n'etiti umu Israel, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu: nkem ka ọ bu.
Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem.
Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.
Josef we si n'ura-ya bilie, me dika mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nyere ya iwu, we kuru nwunye-ya;
Le kwa, i gāturu ime, muta Nwa-nwoke, kpọ aha-Ya Jisus.
Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya.
O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije.
N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna: